Jeremaya 31:7
Jeremiah 31:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb, tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu. Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ, ‘Onyenwe anyị, biko, zọpụta ndị gị, bụ ndị Izrel fọdụrụ.’
Jeremiah 31:7 in English
Jeremiah 31:7 · Berean Standard Bible
For this is what the LORD says: “Sing with joy for Jacob; shout for the foremost of the nations! Make your praises heard, and say, ‘O LORD, save Your people, the remnant of Israel!’
Context
5Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogige
nʼelu ugwu Sameria.
Ndị ọrụ ubi kụrụ ya
ga-erikwa mkpụrụ si na ya. 6Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọ
nʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha,
‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn,
ka anyị jee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.’ ” 7Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb,
tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu.
Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ,
‘Onyenwe anyị, biko, zọpụta ndị gị,
bụ ndị Izrel fọdụrụ.’ 8Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha;
aga m eme ka e si na nsọtụ niile nke ụwa chịkọtaa ha.
Nʼetiti ha ka a ga-ahụ ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ,
na ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme.
Ndị ga-alọta ga-adị nnọọ ukwuu! 9Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta,
ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha.
Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi,
nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha,
nʼihi na aghọọlara m Izrel nna,
Ifrem bụkwa ọkpara m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.