Native Bible

Jeremiah 31:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m ewulikwa gị elu ọzọ, e, aga m eme ka ị bụrụ ihe e wugharịrị ọzọ, gị Izrel bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke. Mgbe ahụ, ị ga-eji ihe iti egwu gị pụọ soro ndị ọṅụ juru obi tee egwu.

Jeremiah 31:4 in English

Jeremiah 31:4 · Berean Standard Bible

Again I will build you, and you will be rebuilt, O Virgin Israel. Again you will take up your tambourines and go out in joyful dancing.

Context

2Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ndị ahụ gbanarịrị mma agha ga-ahụta ihuọma nʼọzara. Aga m abịa iwetara Izrel izuike.” 3Onyenwe anyị mere ka anyị hụ ya anya site nʼebe dị anya, na-asị, “Ọ bụ ịhụnanya nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi ka m ji hụ gị nʼanya; Ọ bụ ebere nke na-adịghị agbanwe ka m ji dọta unu nso. 4Aga m ewulikwa gị elu ọzọ, e, aga m eme ka ị bụrụ ihe e wugharịrị ọzọ, gị Izrel bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke. Mgbe ahụ, ị ga-eji ihe iti egwu gị pụọ soro ndị ọṅụ juru obi tee egwu. 5Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogige nʼelu ugwu Sameria. Ndị ọrụ ubi kụrụ ya ga-erikwa mkpụrụ si na ya. 6Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọ nʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha, ‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn, ka anyị jee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.