Jeremaya 31:3
Jeremiah 31:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị mere ka anyị hụ ya anya site nʼebe dị anya, na-asị, “Ọ bụ ịhụnanya nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi ka m ji hụ gị nʼanya; Ọ bụ ebere nke na-adịghị agbanwe ka m ji dọta unu nso.
Jeremiah 31:3 in English
Jeremiah 31:3 · Berean Standard Bible
The LORD appeared to us in the past, saying:* “I have loved you with an everlasting love; therefore I have drawn you with loving devotion.
Context
1“Nʼoge ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya, sị, “Aga m abụ Chineke nke agbụrụ Izrel niile. Ha ga-abụkwa ndị m.” 2Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Ndị ahụ gbanarịrị mma agha
ga-ahụta ihuọma nʼọzara.
Aga m abịa iwetara Izrel izuike.” 3Onyenwe anyị mere ka anyị hụ ya anya site nʼebe dị anya, na-asị,
“Ọ bụ ịhụnanya nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi ka m ji hụ gị nʼanya;
Ọ bụ ebere nke na-adịghị agbanwe ka m ji dọta unu nso. 4Aga m ewulikwa gị elu ọzọ,
e, aga m eme ka ị bụrụ ihe e wugharịrị ọzọ, gị Izrel bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke.
Mgbe ahụ, ị ga-eji ihe iti egwu gị pụọ
soro ndị ọṅụ juru obi tee egwu. 5Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogige
nʼelu ugwu Sameria.
Ndị ọrụ ubi kụrụ ya
ga-erikwa mkpụrụ si na ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.