Jeremaya 22:19
Jeremiah 22:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-eli ya dịka e si eli ịnyịnya ibu. A ga-adọkpụrụ ozu ya nʼala tufuo ya nʼazụ ọnụ ụzọ ama Jerusalem.”
Jeremiah 22:19 in English
Jeremiah 22:19 · Berean Standard Bible
He will be buried like a donkey, dragged away and thrown outside the gates of Jerusalem.
Context
17Ma anya unu na obi unu
adịghị nʼihe ọzọ ma ọ bụghị naanị nʼuru nʼezighị ezi
nʼiwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha,
na imegbu ndị mmadụ, na iji aka ike pụnara ha ihe ha nwere.” 18Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim nwa Josaya eze Juda:
“Ha agaghị eruru ya uju sị,
‘Ewoo nwanne m nwoke! Ewoo nwanne m nwanyị!’
Ha agaghị eruru ya uju sị,
‘Ewoo nna anyị ukwu! Ewoo ịma mma ya!’ 19A ga-eli ya dịka e si eli ịnyịnya ibu.
A ga-adọkpụrụ ozu ya nʼala tufuo ya
nʼazụ ọnụ ụzọ ama Jerusalem.” 20“Gbagoruo na Lebanọn tie mkpu akwa,
meenụ ka a nụ olu unu na Bashan,
sitekwanụ na Abarim tie mkpu akwa
nʼihi na e gweriela ndị niile unu na ha dị na mma. 21Adọrọ m gị aka na ntị nʼoge ahụ ị nọ na-eche na i guzo chịm,
ma ị jụrụ ige ntị.
Nke a bụkwa omume gị site na mgbe ị bụ nwantakịrị.
Ị jụkwara irubere m isi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.