Jeremaya 22:18
Jeremiah 22:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim nwa Josaya eze Juda: “Ha agaghị eruru ya uju sị, ‘Ewoo nwanne m nwoke! Ewoo nwanne m nwanyị!’ Ha agaghị eruru ya uju sị, ‘Ewoo nna anyị ukwu! Ewoo ịma mma ya!’
Jeremiah 22:18 in English
Jeremiah 22:18 · Berean Standard Bible
Therefore this is what the LORD says concerning Jehoiakim son of Josiah king of Judah: “They will not mourn for him: ‘Alas, my brother! Alas, my sister!’ They will not mourn for him: ‘Alas, my master! Alas, his splendor!’
Context
16O kwuchitere ọnụ ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa,
nke a mere na ihe niile gara nke ọma.
Ọ bụghị nke a bụ ihe ọ pụtara bụ ịmara m?
Ka Onyenwe anyị kwupụtara 17Ma anya unu na obi unu
adịghị nʼihe ọzọ ma ọ bụghị naanị nʼuru nʼezighị ezi
nʼiwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha,
na imegbu ndị mmadụ, na iji aka ike pụnara ha ihe ha nwere.” 18Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim nwa Josaya eze Juda:
“Ha agaghị eruru ya uju sị,
‘Ewoo nwanne m nwoke! Ewoo nwanne m nwanyị!’
Ha agaghị eruru ya uju sị,
‘Ewoo nna anyị ukwu! Ewoo ịma mma ya!’ 19A ga-eli ya dịka e si eli ịnyịnya ibu.
A ga-adọkpụrụ ozu ya nʼala tufuo ya
nʼazụ ọnụ ụzọ ama Jerusalem.” 20“Gbagoruo na Lebanọn tie mkpu akwa,
meenụ ka a nụ olu unu na Bashan,
sitekwanụ na Abarim tie mkpu akwa
nʼihi na e gweriela ndị niile unu na ha dị na mma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.