Jeremaya 22:20
Jeremiah 22:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Gbagoruo na Lebanọn tie mkpu akwa, meenụ ka a nụ olu unu na Bashan, sitekwanụ na Abarim tie mkpu akwa nʼihi na e gweriela ndị niile unu na ha dị na mma.
Jeremiah 22:20 in English
Jeremiah 22:20 · Berean Standard Bible
Go up to Lebanon and cry out; raise your voice in Bashan; cry out from Abarim, for all your lovers have been crushed.
Context
18Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim nwa Josaya eze Juda:
“Ha agaghị eruru ya uju sị,
‘Ewoo nwanne m nwoke! Ewoo nwanne m nwanyị!’
Ha agaghị eruru ya uju sị,
‘Ewoo nna anyị ukwu! Ewoo ịma mma ya!’ 19A ga-eli ya dịka e si eli ịnyịnya ibu.
A ga-adọkpụrụ ozu ya nʼala tufuo ya
nʼazụ ọnụ ụzọ ama Jerusalem.” 20“Gbagoruo na Lebanọn tie mkpu akwa,
meenụ ka a nụ olu unu na Bashan,
sitekwanụ na Abarim tie mkpu akwa
nʼihi na e gweriela ndị niile unu na ha dị na mma. 21Adọrọ m gị aka na ntị nʼoge ahụ ị nọ na-eche na i guzo chịm,
ma ị jụrụ ige ntị.
Nke a bụkwa omume gị site na mgbe ị bụ nwantakịrị.
Ị jụkwara irubere m isi. 22Oke ifufe ga-ebufu ndị ọzụzụ atụrụ gị niile,
a ga-emekwa ka ndị gị na ha dị na mma gaa biri na mba ọzọ.
Mgbe ahụ, ihere ga-eme gị, ị ga-aghọkwa onye e wedara nʼala
nʼihi ajọ omume gị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.