Jeremaya 22:21
Jeremiah 22:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Adọrọ m gị aka na ntị nʼoge ahụ ị nọ na-eche na i guzo chịm, ma ị jụrụ ige ntị. Nke a bụkwa omume gị site na mgbe ị bụ nwantakịrị. Ị jụkwara irubere m isi.
Jeremiah 22:21 in English
Jeremiah 22:21 · Berean Standard Bible
I warned you when you were secure. You said, ‘I will not listen.’ This has been your way from youth, that you have not obeyed My voice.
Context
19A ga-eli ya dịka e si eli ịnyịnya ibu.
A ga-adọkpụrụ ozu ya nʼala tufuo ya
nʼazụ ọnụ ụzọ ama Jerusalem.” 20“Gbagoruo na Lebanọn tie mkpu akwa,
meenụ ka a nụ olu unu na Bashan,
sitekwanụ na Abarim tie mkpu akwa
nʼihi na e gweriela ndị niile unu na ha dị na mma. 21Adọrọ m gị aka na ntị nʼoge ahụ ị nọ na-eche na i guzo chịm,
ma ị jụrụ ige ntị.
Nke a bụkwa omume gị site na mgbe ị bụ nwantakịrị.
Ị jụkwara irubere m isi. 22Oke ifufe ga-ebufu ndị ọzụzụ atụrụ gị niile,
a ga-emekwa ka ndị gị na ha dị na mma gaa biri na mba ọzọ.
Mgbe ahụ, ihere ga-eme gị, ị ga-aghọkwa onye e wedara nʼala
nʼihi ajọ omume gị niile. 23Gị onye na-ebi na Lebanọn,*
onye ebe obibi ya dị nʼụlọ e ji osisi sida wuo,
lee ka i si* na-asụ ude mgbe ihe mgbu bịakwasịrị gị,
ihe mgbu yiri nke nwanyị ime na-eme.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.