Jeremaya 22:23
Jeremiah 22:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gị onye na-ebi na Lebanọn,* onye ebe obibi ya dị nʼụlọ e ji osisi sida wuo, lee ka i si* na-asụ ude mgbe ihe mgbu bịakwasịrị gị, ihe mgbu yiri nke nwanyị ime na-eme.
Jeremiah 22:23 in English
Jeremiah 22:23 · Berean Standard Bible
O inhabitant of Lebanon,* nestled in the cedars, how you will groan when pangs of anguish come upon you, agony like a woman in labor.”
Context
21Adọrọ m gị aka na ntị nʼoge ahụ ị nọ na-eche na i guzo chịm,
ma ị jụrụ ige ntị.
Nke a bụkwa omume gị site na mgbe ị bụ nwantakịrị.
Ị jụkwara irubere m isi. 22Oke ifufe ga-ebufu ndị ọzụzụ atụrụ gị niile,
a ga-emekwa ka ndị gị na ha dị na mma gaa biri na mba ọzọ.
Mgbe ahụ, ihere ga-eme gị, ị ga-aghọkwa onye e wedara nʼala
nʼihi ajọ omume gị niile. 23Gị onye na-ebi na Lebanọn,*
onye ebe obibi ya dị nʼụlọ e ji osisi sida wuo,
lee ka i si* na-asụ ude mgbe ihe mgbu bịakwasịrị gị,
ihe mgbu yiri nke nwanyị ime na-eme. 24“Ma dịka m na-adị ndụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “a sịkwarị na gị, bụ Jehoiakin, nwa Jehoiakim eze Juda, bụ mgbaaka akara m gbanyere na mkpịsịaka dị nʼaka nri m, aga m agbapụkwa gị, 25were gị nyefee nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ gị ike, bụ ndị ahụ ị na-atụ ụjọ ha. Aga m enyefe gị nʼaka Nebukadneza eze Babilọn na ndị Kaldịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.