Jeremaya 22:24
Jeremiah 22:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma dịka m na-adị ndụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “a sịkwarị na gị, bụ Jehoiakin, nwa Jehoiakim eze Juda, bụ mgbaaka akara m gbanyere na mkpịsịaka dị nʼaka nri m, aga m agbapụkwa gị,
Jeremiah 22:24 in English
Jeremiah 22:24 · Berean Standard Bible
“As surely as I live,” declares the LORD, “even if you, Coniah * son of Jehoiakim king of Judah, were a signet ring on My right hand, I would pull you off.
Context
22Oke ifufe ga-ebufu ndị ọzụzụ atụrụ gị niile,
a ga-emekwa ka ndị gị na ha dị na mma gaa biri na mba ọzọ.
Mgbe ahụ, ihere ga-eme gị, ị ga-aghọkwa onye e wedara nʼala
nʼihi ajọ omume gị niile. 23Gị onye na-ebi na Lebanọn,*
onye ebe obibi ya dị nʼụlọ e ji osisi sida wuo,
lee ka i si* na-asụ ude mgbe ihe mgbu bịakwasịrị gị,
ihe mgbu yiri nke nwanyị ime na-eme. 24“Ma dịka m na-adị ndụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “a sịkwarị na gị, bụ Jehoiakin, nwa Jehoiakim eze Juda, bụ mgbaaka akara m gbanyere na mkpịsịaka dị nʼaka nri m, aga m agbapụkwa gị, 25were gị nyefee nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ gị ike, bụ ndị ahụ ị na-atụ ụjọ ha. Aga m enyefe gị nʼaka Nebukadneza eze Babilọn na ndị Kaldịa. 26Aga m atụfu gị na nne mụrụ gị, tụga unu na mba ọzọ dị iche site nʼobodo a nọ mụọ unu. Ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.