Jeremaya 2:3
Jeremiah 2:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Izrel bụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị, mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ya. Ndị niile ripịara ya ka a gụrụ dị ka ndị ikpe mara. Ihe ọjọọ dakwasịkwara ha.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Jeremiah 2:3 in English
Jeremiah 2:3 · Berean Standard Bible
Israel was holy to the LORD, the firstfruits of His harvest. All who devoured her found themselves guilty; disaster came upon them,’” declares the LORD.
Context
1Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m na-asị, 2“Gaa, kwupụta na ntị Jerusalem,
“Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Echetara m ịnụ ọkụ nʼobi nke okorobịa gị nʼoge gara aga ime ihe ga-atọ m ụtọ,
ịhụnanya gị dịka onye a lụrụ ọhụrụ,
echetakwara m otu unu si soro m nʼime ọzara,
ga nʼala tọgbọrọ nʼefu nke a na-akụghị mkpụrụ. 3Izrel bụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị,
mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ya.
Ndị niile ripịara ya ka a gụrụ dị ka ndị ikpe mara.
Ihe ọjọọ dakwasịkwara ha.’ ”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 4Nụrụ okwu nke Onyenwe anyị unu ụlọ Jekọb,
na unu ndị bụ agbụrụ niile sitere nʼIzrel. 5Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Gịnị bụ ihe ọjọọ nna unu ha chọpụtara nʼime m,
mere ha ji si nʼebe m nọ kpafuo, nọrọ m ebe dị anya?
Nke mere na ha ghọrọ ndị nzuzu
site nʼịgbaso arụsị?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.