Jeremaya 2:4
Jeremiah 2:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nụrụ okwu nke Onyenwe anyị unu ụlọ Jekọb, na unu ndị bụ agbụrụ niile sitere nʼIzrel.
Jeremiah 2:4 in English
Jeremiah 2:4 · Berean Standard Bible
Hear the word of the LORD, O house of Jacob, and all you families of the house of Israel.
Context
2“Gaa, kwupụta na ntị Jerusalem,
“Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Echetara m ịnụ ọkụ nʼobi nke okorobịa gị nʼoge gara aga ime ihe ga-atọ m ụtọ,
ịhụnanya gị dịka onye a lụrụ ọhụrụ,
echetakwara m otu unu si soro m nʼime ọzara,
ga nʼala tọgbọrọ nʼefu nke a na-akụghị mkpụrụ. 3Izrel bụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị,
mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ya.
Ndị niile ripịara ya ka a gụrụ dị ka ndị ikpe mara.
Ihe ọjọọ dakwasịkwara ha.’ ”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 4Nụrụ okwu nke Onyenwe anyị unu ụlọ Jekọb,
na unu ndị bụ agbụrụ niile sitere nʼIzrel. 5Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Gịnị bụ ihe ọjọọ nna unu ha chọpụtara nʼime m,
mere ha ji si nʼebe m nọ kpafuo, nọrọ m ebe dị anya?
Nke mere na ha ghọrọ ndị nzuzu
site nʼịgbaso arụsị? 6Ha ajụghị ‘Olee ebe Onyenwe anyị ahụ nọ,
bụ onye sitere nʼala Ijipt kpọpụta anyị,
duuru anyị gafee ọzara tọgbọrọ nʼefu,
nʼala ọzara na ala olulu jupụtara,
ala nke akpịrị ịkpọ nkụ na nke oke ọchịchịrị,
ala ebe ọ dịghị onye na-esi na ya agafee na nke mmadụ na-ebighị na ya?’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.