Jeremaya 2:5
Jeremiah 2:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nna unu ha chọpụtara nʼime m, mere ha ji si nʼebe m nọ kpafuo, nọrọ m ebe dị anya? Nke mere na ha ghọrọ ndị nzuzu site nʼịgbaso arụsị?
Jeremiah 2:5 in English
Jeremiah 2:5 · Berean Standard Bible
This is what the LORD says: “What fault did your fathers find in Me that they strayed so far from Me, and followed worthless idols, and became worthless themselves?
Context
3Izrel bụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị,
mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ya.
Ndị niile ripịara ya ka a gụrụ dị ka ndị ikpe mara.
Ihe ọjọọ dakwasịkwara ha.’ ”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 4Nụrụ okwu nke Onyenwe anyị unu ụlọ Jekọb,
na unu ndị bụ agbụrụ niile sitere nʼIzrel. 5Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Gịnị bụ ihe ọjọọ nna unu ha chọpụtara nʼime m,
mere ha ji si nʼebe m nọ kpafuo, nọrọ m ebe dị anya?
Nke mere na ha ghọrọ ndị nzuzu
site nʼịgbaso arụsị? 6Ha ajụghị ‘Olee ebe Onyenwe anyị ahụ nọ,
bụ onye sitere nʼala Ijipt kpọpụta anyị,
duuru anyị gafee ọzara tọgbọrọ nʼefu,
nʼala ọzara na ala olulu jupụtara,
ala nke akpịrị ịkpọ nkụ na nke oke ọchịchịrị,
ala ebe ọ dịghị onye na-esi na ya agafee na nke mmadụ na-ebighị na ya?’ 7Ọ bụ m kpọbatara unu nʼala na-amị ọtụtụ mkpụrụ,
ka unu rie ihe dị ukwuu na ihe dị mma si nʼime ya.
Ma unu bara merụọ ala m
unu mere ihe nketa m ka ọ ghọọ ihe arụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.