Native Bible

Jeremiah 2:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m na-asị,

Jeremiah 2:1 in English

Jeremiah 2:1 · Berean Standard Bible

Now the word of the LORD came to me, saying,

Context

1Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m na-asị, 2“Gaa, kwupụta na ntị Jerusalem, “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Echetara m ịnụ ọkụ nʼobi nke okorobịa gị nʼoge gara aga ime ihe ga-atọ m ụtọ, ịhụnanya gị dịka onye a lụrụ ọhụrụ, echetakwara m otu unu si soro m nʼime ọzara, ga nʼala tọgbọrọ nʼefu nke a na-akụghị mkpụrụ. 3Izrel bụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị, mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ya. Ndị niile ripịara ya ka a gụrụ dị ka ndị ikpe mara. Ihe ọjọọ dakwasịkwara ha.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.