Jeremaya 18:14
Jeremiah 18:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O nweela mgbe mmiri oyi m mere ka ọ kpụkọtaa kọrọ nʼelu ugwu Lebanọn? O nweela mgbe mmiri ya jụrụ oyi, nke si nʼebe dị anya na-asọdata ji akwụsị ịsọ asọ?
Jeremiah 18:14 in English
Jeremiah 18:14 · Berean Standard Bible
Does the snow of Lebanon ever leave its rocky slopes? Or do its cool waters flowing from a distance ever run dry?
Context
12Ma ha ga-aza sị, ‘O nweghị isi! Anyị ga-anọgide na-eme ihe ọbụla anyị chepụtara nʼechiche anyị, na-emekwa atụmatụ isiike nke obi ọjọọ anyị tụpụtara.’ ” 13Nʼihi ya ka Onyenwe anyị ji kwuo sị,
“Jụtanụ ajụjụ nʼetiti mba niile,
onye nụrụla ihe dị otu a?
Ndị m, Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke
emeela ihe jọgburu onwe ya. 14O nweela mgbe mmiri oyi m mere ka ọ kpụkọtaa
kọrọ nʼelu ugwu Lebanọn?
O nweela mgbe mmiri ya jụrụ oyi,
nke si nʼebe dị anya na-asọdata ji akwụsị ịsọ asọ? 15Ma ndị m echezọọla m.
Ha na-achụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị na-enweghị isi,
bụ arụsị ndị ahụ mere ka ha sọọ ngọngọ nʼụzọ ha niile.
Ha sụrụ ngọngọ hapụ ịgbasokwa ụzọ ọma ahụ dị site na mgbe ochie.
Kama ha na-eje ije nʼụzọ ọhịa, nke na-enweghị ụkpụrụ,
nke a na-ewuzighị ewuzi. 16Ala ha ga-atọgbọrọ nʼefu.
Ọ ga-aghọ ihe iju anya ruo ebighị ebi.
Ndị si nʼakụkụ ya na-agafe ga-efufe isi ha,
nʼihi na ihe ha ga-ahụ ga-eju ha anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.