Jeremaya 18:12
Jeremiah 18:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ha ga-aza sị, ‘O nweghị isi! Anyị ga-anọgide na-eme ihe ọbụla anyị chepụtara nʼechiche anyị, na-emekwa atụmatụ isiike nke obi ọjọọ anyị tụpụtara.’ ”
Jeremiah 18:12 in English
Jeremiah 18:12 · Berean Standard Bible
But they will reply, ‘It is hopeless. We will follow our own plans, and each of us will act according to the stubbornness of his evil heart.’”
Context
10ọ bụrụ na o mee ihe jọrọ njọ nʼanya m, jụ irubere m isi, agaghị m emere ya ihe ọma ahụ m zubere imere ya. 11“Ugbu a, gwa ndị Juda na ndị ahụ bi na Jerusalem, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Lee, ana m akwado mbibi nke ga-abịakwasị unu; ana m echekwa echiche ọjọọ megide unu. Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu site nʼụzọ ọjọọ ya chegharịa, ya meekwa ka ụzọ ya na omume ya zie ezi.’ 12Ma ha ga-aza sị, ‘O nweghị isi! Anyị ga-anọgide na-eme ihe ọbụla anyị chepụtara nʼechiche anyị, na-emekwa atụmatụ isiike nke obi ọjọọ anyị tụpụtara.’ ” 13Nʼihi ya ka Onyenwe anyị ji kwuo sị,
“Jụtanụ ajụjụ nʼetiti mba niile,
onye nụrụla ihe dị otu a?
Ndị m, Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke
emeela ihe jọgburu onwe ya. 14O nweela mgbe mmiri oyi m mere ka ọ kpụkọtaa
kọrọ nʼelu ugwu Lebanọn?
O nweela mgbe mmiri ya jụrụ oyi,
nke si nʼebe dị anya na-asọdata ji akwụsị ịsọ asọ?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.