Jeremaya 18:13
Jeremiah 18:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya ka Onyenwe anyị ji kwuo sị, “Jụtanụ ajụjụ nʼetiti mba niile, onye nụrụla ihe dị otu a? Ndị m, Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke emeela ihe jọgburu onwe ya.
Jeremiah 18:13 in English
Jeremiah 18:13 · Berean Standard Bible
Therefore this is what the LORD says: “Inquire among the nations: Who has ever heard things like these? Virgin Israel has done a most terrible thing.
Context
11“Ugbu a, gwa ndị Juda na ndị ahụ bi na Jerusalem, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Lee, ana m akwado mbibi nke ga-abịakwasị unu; ana m echekwa echiche ọjọọ megide unu. Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu site nʼụzọ ọjọọ ya chegharịa, ya meekwa ka ụzọ ya na omume ya zie ezi.’ 12Ma ha ga-aza sị, ‘O nweghị isi! Anyị ga-anọgide na-eme ihe ọbụla anyị chepụtara nʼechiche anyị, na-emekwa atụmatụ isiike nke obi ọjọọ anyị tụpụtara.’ ” 13Nʼihi ya ka Onyenwe anyị ji kwuo sị,
“Jụtanụ ajụjụ nʼetiti mba niile,
onye nụrụla ihe dị otu a?
Ndị m, Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke
emeela ihe jọgburu onwe ya. 14O nweela mgbe mmiri oyi m mere ka ọ kpụkọtaa
kọrọ nʼelu ugwu Lebanọn?
O nweela mgbe mmiri ya jụrụ oyi,
nke si nʼebe dị anya na-asọdata ji akwụsị ịsọ asọ? 15Ma ndị m echezọọla m.
Ha na-achụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị na-enweghị isi,
bụ arụsị ndị ahụ mere ka ha sọọ ngọngọ nʼụzọ ha niile.
Ha sụrụ ngọngọ hapụ ịgbasokwa ụzọ ọma ahụ dị site na mgbe ochie.
Kama ha na-eje ije nʼụzọ ọhịa, nke na-enweghị ụkpụrụ,
nke a na-ewuzighị ewuzi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.