Jeremaya 18:16
Jeremiah 18:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ala ha ga-atọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-aghọ ihe iju anya ruo ebighị ebi. Ndị si nʼakụkụ ya na-agafe ga-efufe isi ha, nʼihi na ihe ha ga-ahụ ga-eju ha anya.
Jeremiah 18:16 in English
Jeremiah 18:16 · Berean Standard Bible
They have made their land a desolation, a perpetual object of scorn; all who pass by will be appalled and shake their heads.
Context
14O nweela mgbe mmiri oyi m mere ka ọ kpụkọtaa
kọrọ nʼelu ugwu Lebanọn?
O nweela mgbe mmiri ya jụrụ oyi,
nke si nʼebe dị anya na-asọdata ji akwụsị ịsọ asọ? 15Ma ndị m echezọọla m.
Ha na-achụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị na-enweghị isi,
bụ arụsị ndị ahụ mere ka ha sọọ ngọngọ nʼụzọ ha niile.
Ha sụrụ ngọngọ hapụ ịgbasokwa ụzọ ọma ahụ dị site na mgbe ochie.
Kama ha na-eje ije nʼụzọ ọhịa, nke na-enweghị ụkpụrụ,
nke a na-ewuzighị ewuzi. 16Ala ha ga-atọgbọrọ nʼefu.
Ọ ga-aghọ ihe iju anya ruo ebighị ebi.
Ndị si nʼakụkụ ya na-agafe ga-efufe isi ha,
nʼihi na ihe ha ga-ahụ ga-eju ha anya. 17Aga m achụsa ha nʼihu ndị iro ha
dịka ifufe na-efe site nʼọwụwa anyanwụ.
Aga m agbakụta ha azụ.
Ha agaghị ahụkwa ihu m anya nʼụbọchị ahụ mbibi ga-abịakwasị ha.” 18Ha sịrị, “Bịanụ ka anyị gbaa izu megide Jeremaya, nʼihi na izi iwu agaghị esite nʼebe ndị nchụaja nọ kwụsị, maọbụ ndụmọdụ nʼebe ndị maara ihe, ma ọ bụkwanụ okwu site nʼebe ndị amụma nọ. Ya mere, bịanụ ka anyị were ire anyị buso ya agha,* gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ọbụla nke ọ na-ekwu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.