Native Bible

Jeremiah 17:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya. Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị.

Jeremiah 17:7 in English

Jeremiah 17:7 · Berean Standard Bible

But blessed is the man who trusts in the LORD, whose confidence is in Him.

Context

5Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi, onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka, onye wezugara obi ya site nʼebe Onyenwe anyị nọ. 6Onye ahụ ga-adị ka osisi na-eto nʼala tọgbọrọ nʼefu. Ọ gaghị ahụkwa mgbe ọ dịmma na-abịara ya. Ọ ga-ebi nʼebe niile kpọrọ nkụ nke ọzara, nʼala nnu nnu, ebe ndị mmadụ na-ebighị. 7“Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya. Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị. 8Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ. Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ, akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya. Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị. Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ.” 9Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile, o nwekwaghị ngwọta. Onye pụrụ ịghọta ya?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.