Jeremaya 17:7
Jeremiah 17:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya. Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị.
Jeremiah 17:7 in English
Jeremiah 17:7 · Berean Standard Bible
But blessed is the man who trusts in the LORD, whose confidence is in Him.
Context
5Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi,
onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka,
onye wezugara obi ya site nʼebe Onyenwe anyị nọ. 6Onye ahụ ga-adị ka osisi na-eto nʼala tọgbọrọ nʼefu.
Ọ gaghị ahụkwa mgbe ọ dịmma na-abịara ya.
Ọ ga-ebi nʼebe niile kpọrọ nkụ nke ọzara,
nʼala nnu nnu, ebe ndị mmadụ na-ebighị. 7“Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya.
Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị. 8Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi,
nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ.
Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ,
akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya.
Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị.
Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ.” 9Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile,
o nwekwaghị ngwọta.
Onye pụrụ ịghọta ya?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.