Jeremaya 17:9
Jeremiah 17:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile, o nwekwaghị ngwọta. Onye pụrụ ịghọta ya?
Jeremiah 17:9 in English
Jeremiah 17:9 · Berean Standard Bible
The heart is deceitful above all things and beyond cure. Who can understand it?
Context
7“Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya.
Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị. 8Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi,
nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ.
Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ,
akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya.
Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị.
Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ.” 9Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile,
o nwekwaghị ngwọta.
Onye pụrụ ịghọta ya? 10“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-enyocha obi,
na-anwụpụta ihe dị nʼime mmụọ,
nʼihi ịkwụ mmadụ ụgwọ dịka ọrụ ya si dị,
na dịka ihe ruuru ya si dị nʼihi ọrụ ya.” 11Dịka ọkwa si ekpokọba akwa ọ na-eyighị,
otu a ka ndị na-akpakọba akụ nʼụzọ na-ezighị ezi dị.
Nʼetiti ụbọchị ndụ ha, akụ ndị a ga-efunarị ha.
Nʼikpeazụ ha ga-aghọ ndị nzuzu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.