Jeremaya 17:8
Jeremiah 17:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ. Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ, akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya. Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị. Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ.”
Jeremiah 17:8 in English
Jeremiah 17:8 · Berean Standard Bible
He is like a tree planted by the waters that sends out its roots toward the stream. It does not fear when the heat comes, and its leaves are always green. It does not worry in a year of drought, nor does it cease to produce fruit.
Context
6Onye ahụ ga-adị ka osisi na-eto nʼala tọgbọrọ nʼefu.
Ọ gaghị ahụkwa mgbe ọ dịmma na-abịara ya.
Ọ ga-ebi nʼebe niile kpọrọ nkụ nke ọzara,
nʼala nnu nnu, ebe ndị mmadụ na-ebighị. 7“Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya.
Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị. 8Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi,
nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ.
Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ,
akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya.
Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị.
Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ.” 9Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile,
o nwekwaghị ngwọta.
Onye pụrụ ịghọta ya? 10“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-enyocha obi,
na-anwụpụta ihe dị nʼime mmụọ,
nʼihi ịkwụ mmadụ ụgwọ dịka ọrụ ya si dị,
na dịka ihe ruuru ya si dị nʼihi ọrụ ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.