Jeremaya 17:6
Jeremiah 17:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ahụ ga-adị ka osisi na-eto nʼala tọgbọrọ nʼefu. Ọ gaghị ahụkwa mgbe ọ dịmma na-abịara ya. Ọ ga-ebi nʼebe niile kpọrọ nkụ nke ọzara, nʼala nnu nnu, ebe ndị mmadụ na-ebighị.
Jeremiah 17:6 in English
Jeremiah 17:6 · Berean Standard Bible
He will be like a shrub in the desert; he will not see when prosperity comes. He will dwell in the parched places of the desert, in a salt land where no one lives.
Context
4Ihe nketa ahụ m nyere gị ga-efunarị gị,
nʼihi ihe i ji aka gị wetara onwe gị.
Aga m emekwa ka ị bụrụ ohu ndị iro gị
nʼala nke ị na-amaghị,
nʼihi na ị kpasuola iwe m,
ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe niile ebighị ebi.” 5Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi,
onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka,
onye wezugara obi ya site nʼebe Onyenwe anyị nọ. 6Onye ahụ ga-adị ka osisi na-eto nʼala tọgbọrọ nʼefu.
Ọ gaghị ahụkwa mgbe ọ dịmma na-abịara ya.
Ọ ga-ebi nʼebe niile kpọrọ nkụ nke ọzara,
nʼala nnu nnu, ebe ndị mmadụ na-ebighị. 7“Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya.
Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị. 8Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi,
nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ.
Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ,
akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya.
Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị.
Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.