Jeremaya 17:5
Jeremiah 17:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi, onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka, onye wezugara obi ya site nʼebe Onyenwe anyị nọ.
Jeremiah 17:5 in English
Jeremiah 17:5 · Berean Standard Bible
This is what the LORD says: “Cursed is the man who trusts in mankind, who makes the flesh his strength * and turns his heart from the LORD.
Context
3Ugwu m, nke dị nʼala ahụ,
na ihe niile ha nwere, na akụnụba ha
ka m ga-eweta nye ndị ga-adọta ha nʼagha.
Aga m enyekwa ha ihe niile ahụ dị nʼelu ugwu,
nʼihi mmehie gị, nke jupụtara nʼala gị niile. 4Ihe nketa ahụ m nyere gị ga-efunarị gị,
nʼihi ihe i ji aka gị wetara onwe gị.
Aga m emekwa ka ị bụrụ ohu ndị iro gị
nʼala nke ị na-amaghị,
nʼihi na ị kpasuola iwe m,
ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe niile ebighị ebi.” 5Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi,
onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka,
onye wezugara obi ya site nʼebe Onyenwe anyị nọ. 6Onye ahụ ga-adị ka osisi na-eto nʼala tọgbọrọ nʼefu.
Ọ gaghị ahụkwa mgbe ọ dịmma na-abịara ya.
Ọ ga-ebi nʼebe niile kpọrọ nkụ nke ọzara,
nʼala nnu nnu, ebe ndị mmadụ na-ebighị. 7“Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya.
Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.