Jeremaya 17:3
Jeremiah 17:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugwu m, nke dị nʼala ahụ, na ihe niile ha nwere, na akụnụba ha ka m ga-eweta nye ndị ga-adọta ha nʼagha. Aga m enyekwa ha ihe niile ahụ dị nʼelu ugwu, nʼihi mmehie gị, nke jupụtara nʼala gị niile.
Jeremiah 17:3 in English
Jeremiah 17:3 · Berean Standard Bible
O My mountain in the countryside, I will give over your wealth and all your treasures as plunder, because of the sin of your high places, within all your borders.
Context
1“E ji mkpisi igwe gbunye mmehie Juda,
jikwa ọnụ nkume siri ike a pịrị ọnụ* ya apị,
depụta nʼelu mbadamba nkume, bụ obi ha,
nakwa nʼelu mpi niile nke ebe ịchụ aja ha. 2Ọ bụladị ụmụ ha na-echeta ebe ịchụ aja ha,
na ogidi a manyere nʼala nʼihi arụsị Ashera,
nke dị nʼebe ọtụtụ osisi ndụ na-etokọ ọnụ,
ma nʼelu ugwu nta niile. 3Ugwu m, nke dị nʼala ahụ,
na ihe niile ha nwere, na akụnụba ha
ka m ga-eweta nye ndị ga-adọta ha nʼagha.
Aga m enyekwa ha ihe niile ahụ dị nʼelu ugwu,
nʼihi mmehie gị, nke jupụtara nʼala gị niile. 4Ihe nketa ahụ m nyere gị ga-efunarị gị,
nʼihi ihe i ji aka gị wetara onwe gị.
Aga m emekwa ka ị bụrụ ohu ndị iro gị
nʼala nke ị na-amaghị,
nʼihi na ị kpasuola iwe m,
ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe niile ebighị ebi.” 5Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi,
onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka,
onye wezugara obi ya site nʼebe Onyenwe anyị nọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.