Jeremaya 17:1
Jeremiah 17:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“E ji mkpisi igwe gbunye mmehie Juda, jikwa ọnụ nkume siri ike a pịrị ọnụ* ya apị, depụta nʼelu mbadamba nkume, bụ obi ha, nakwa nʼelu mpi niile nke ebe ịchụ aja ha.
Jeremiah 17:1 in English
Jeremiah 17:1 · Berean Standard Bible
“The sin of Judah is written with an iron stylus, engraved with a diamond point on the tablets of their hearts and on the horns of their altars.
Context
1“E ji mkpisi igwe gbunye mmehie Juda,
jikwa ọnụ nkume siri ike a pịrị ọnụ* ya apị,
depụta nʼelu mbadamba nkume, bụ obi ha,
nakwa nʼelu mpi niile nke ebe ịchụ aja ha. 2Ọ bụladị ụmụ ha na-echeta ebe ịchụ aja ha,
na ogidi a manyere nʼala nʼihi arụsị Ashera,
nke dị nʼebe ọtụtụ osisi ndụ na-etokọ ọnụ,
ma nʼelu ugwu nta niile. 3Ugwu m, nke dị nʼala ahụ,
na ihe niile ha nwere, na akụnụba ha
ka m ga-eweta nye ndị ga-adọta ha nʼagha.
Aga m enyekwa ha ihe niile ahụ dị nʼelu ugwu,
nʼihi mmehie gị, nke jupụtara nʼala gị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.