Jeremaya 16:17
Jeremiah 16:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ana m ahụzu ụzọ ha niile. O nweghị ihe zoro ezo nʼebe m nọ. Anya m na-ahụzukwa mmehie ha niile.
Jeremiah 16:17 in English
Jeremiah 16:17 · Berean Standard Bible
For My eyes are on all their ways. They are not hidden from My face, and their guilt is not concealed from My eyes.
Context
15Ma a ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọpụtara Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba ahụ niile ọ chụsara ha.’ Nʼihi na aga m akpọlata ha nʼala ahụ m nyere nna nna ha. 16“Ma ugbu a, aga m ezipu ọtụtụ ndị ọkụ azụ ka ha gaa jide ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Mgbe nke ahụ gasịrị, aga m ezipụkwa ọtụtụ ndị na-achụ nta, ndị ga-esite nʼelu ugwu ukwu niile na nʼelu ugwu nta niile, na nʼọnụ mgbawara dị na nkume niile, chụọ nta ha. 17Ana m ahụzu ụzọ ha niile. O nweghị ihe zoro ezo nʼebe m nọ. Anya m na-ahụzukwa mmehie ha niile. 18Aga m akwụghachi ha okpukpu abụọ nʼihi ajọ omume ha, na mmehie ha, nʼihi na ha ejirila oyiyi ihe arụ a pịrị apị ha, nke na-enweghị ndụ nʼime ya, merụọ ala m. Ha emeekwala ka arụsị bụ ihe arụ jupụta nʼihe nketa m.” 19Onyenwe anyị, ị bụ ike m na ebe m e wusiri ike,
ebe mgbaba m nʼoge nsogbu.
Mba niile nke ụwa ga-esite na nsọtụ ụwa niile bịakwute gị.
Ha ga-abịakwute gị sị gị,
“Nna anyị ha enweghị ihe ọbụla karịakwa chi ndị na-abụghị chi nʼezie.
Ha bụkwa chi na-abaghị uru, nke na-adịghị ewetara ha ihe ọma ọbụla.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.