Jeremaya 16:18
Jeremiah 16:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m akwụghachi ha okpukpu abụọ nʼihi ajọ omume ha, na mmehie ha, nʼihi na ha ejirila oyiyi ihe arụ a pịrị apị ha, nke na-enweghị ndụ nʼime ya, merụọ ala m. Ha emeekwala ka arụsị bụ ihe arụ jupụta nʼihe nketa m.”
Jeremiah 16:18 in English
Jeremiah 16:18 · Berean Standard Bible
And I will first repay them double their iniquity and their sin, because they have defiled My land with the carcasses of their detestable idols, and they have filled My inheritance with their abominations.”
Context
16“Ma ugbu a, aga m ezipu ọtụtụ ndị ọkụ azụ ka ha gaa jide ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Mgbe nke ahụ gasịrị, aga m ezipụkwa ọtụtụ ndị na-achụ nta, ndị ga-esite nʼelu ugwu ukwu niile na nʼelu ugwu nta niile, na nʼọnụ mgbawara dị na nkume niile, chụọ nta ha. 17Ana m ahụzu ụzọ ha niile. O nweghị ihe zoro ezo nʼebe m nọ. Anya m na-ahụzukwa mmehie ha niile. 18Aga m akwụghachi ha okpukpu abụọ nʼihi ajọ omume ha, na mmehie ha, nʼihi na ha ejirila oyiyi ihe arụ a pịrị apị ha, nke na-enweghị ndụ nʼime ya, merụọ ala m. Ha emeekwala ka arụsị bụ ihe arụ jupụta nʼihe nketa m.” 19Onyenwe anyị, ị bụ ike m na ebe m e wusiri ike,
ebe mgbaba m nʼoge nsogbu.
Mba niile nke ụwa ga-esite na nsọtụ ụwa niile bịakwute gị.
Ha ga-abịakwute gị sị gị,
“Nna anyị ha enweghị ihe ọbụla karịakwa chi ndị na-abụghị chi nʼezie.
Ha bụkwa chi na-abaghị uru, nke na-adịghị ewetara ha ihe ọma ọbụla.” 20Mmadụ ọ pụrụ imere onwe ya chi?
E, ma chi ndị ahụ abụghị chi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.