Native Bible

Jeremiah 16:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mmadụ ọ pụrụ imere onwe ya chi? E, ma chi ndị ahụ abụghị chi.

Jeremiah 16:20 in English

Jeremiah 16:20 · Berean Standard Bible

Can man make gods for himself? Such are not gods!”

Context

18Aga m akwụghachi ha okpukpu abụọ nʼihi ajọ omume ha, na mmehie ha, nʼihi na ha ejirila oyiyi ihe arụ a pịrị apị ha, nke na-enweghị ndụ nʼime ya, merụọ ala m. Ha emeekwala ka arụsị bụ ihe arụ jupụta nʼihe nketa m.” 19Onyenwe anyị, ị bụ ike m na ebe m e wusiri ike, ebe mgbaba m nʼoge nsogbu. Mba niile nke ụwa ga-esite na nsọtụ ụwa niile bịakwute gị. Ha ga-abịakwute gị sị gị, “Nna anyị ha enweghị ihe ọbụla karịakwa chi ndị na-abụghị chi nʼezie. Ha bụkwa chi na-abaghị uru, nke na-adịghị ewetara ha ihe ọma ọbụla.” 20Mmadụ ọ pụrụ imere onwe ya chi? E, ma chi ndị ahụ abụghị chi. 21“Ya mere, aga m eme ka ha mata. Nʼoge a ka m ga-eme ka ha mata ike m, na ịdị ike m. Mgbe ahụ, ha ga-amata na aha m bụ Onyenwe anyị. 16:5 Iti ha aka nʼobi 16:14 Ejikwa ụdị okwu ndị a malite ịṅụ iyi ha

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.