Jeremaya 16:19
Jeremiah 16:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị, ị bụ ike m na ebe m e wusiri ike, ebe mgbaba m nʼoge nsogbu. Mba niile nke ụwa ga-esite na nsọtụ ụwa niile bịakwute gị. Ha ga-abịakwute gị sị gị, “Nna anyị ha enweghị ihe ọbụla karịakwa chi ndị na-abụghị chi nʼezie. Ha bụkwa chi na-abaghị uru, nke na-adịghị ewetara ha ihe ọma ọbụla.”
Jeremiah 16:19 in English
Jeremiah 16:19 · Berean Standard Bible
O LORD, my strength and my fortress, my refuge in the day of distress, the nations will come to You from the ends of the earth, and they will say, “Our fathers inherited nothing but lies, worthless idols of no benefit at all.
Context
17Ana m ahụzu ụzọ ha niile. O nweghị ihe zoro ezo nʼebe m nọ. Anya m na-ahụzukwa mmehie ha niile. 18Aga m akwụghachi ha okpukpu abụọ nʼihi ajọ omume ha, na mmehie ha, nʼihi na ha ejirila oyiyi ihe arụ a pịrị apị ha, nke na-enweghị ndụ nʼime ya, merụọ ala m. Ha emeekwala ka arụsị bụ ihe arụ jupụta nʼihe nketa m.” 19Onyenwe anyị, ị bụ ike m na ebe m e wusiri ike,
ebe mgbaba m nʼoge nsogbu.
Mba niile nke ụwa ga-esite na nsọtụ ụwa niile bịakwute gị.
Ha ga-abịakwute gị sị gị,
“Nna anyị ha enweghị ihe ọbụla karịakwa chi ndị na-abụghị chi nʼezie.
Ha bụkwa chi na-abaghị uru, nke na-adịghị ewetara ha ihe ọma ọbụla.” 20Mmadụ ọ pụrụ imere onwe ya chi?
E, ma chi ndị ahụ abụghị chi. 21“Ya mere, aga m eme ka ha mata.
Nʼoge a ka m ga-eme ka ha mata ike m,
na ịdị ike m.
Mgbe ahụ, ha ga-amata
na aha m bụ Onyenwe anyị.
16:5 Iti ha aka nʼobi
16:14 Ejikwa ụdị okwu ndị a malite ịṅụ iyi ha
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.