Native Bible

Jeremiah 16:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma a ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọpụtara Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba ahụ niile ọ chụsara ha.’ Nʼihi na aga m akpọlata ha nʼala ahụ m nyere nna nna ha.

Jeremiah 16:15 in English

Jeremiah 16:15 · Berean Standard Bible

Instead they will say, ‘As surely as the LORD lives, who brought the Israelites up out of the land of the north and all the other lands to which He had banished them.’ For I will return them to their land that I gave to their forefathers.

Context

13Ya mere, aga m esite nʼala a tufuo unu. Aga m atụbanye unu nʼala ahụ unu na nna unu ha na-amaghị. Ebe ahụ ka unu ga-anọkwa fee chi ndị ọzọ ehihie na abalị. Nʼihi na agaghị m emere unu amara.’ 14“Otu ọ dị, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ,* ‘Dịka Onyenwe anyị na adị ndụ, bụ onye ahụ sitere nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel.’ 15Ma a ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọpụtara Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba ahụ niile ọ chụsara ha.’ Nʼihi na aga m akpọlata ha nʼala ahụ m nyere nna nna ha. 16“Ma ugbu a, aga m ezipu ọtụtụ ndị ọkụ azụ ka ha gaa jide ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Mgbe nke ahụ gasịrị, aga m ezipụkwa ọtụtụ ndị na-achụ nta, ndị ga-esite nʼelu ugwu ukwu niile na nʼelu ugwu nta niile, na nʼọnụ mgbawara dị na nkume niile, chụọ nta ha. 17Ana m ahụzu ụzọ ha niile. O nweghị ihe zoro ezo nʼebe m nọ. Anya m na-ahụzukwa mmehie ha niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.