Jeremaya 14:6
Jeremiah 14:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịnyịnya ibu ọhịa na-eguzokwa nʼelu ebe dị elu nke ahịhịa na-adịghị. Ha na-eku ume na-ekupụ ngwangwa, ngwangwa, dịka nkịta ọhịa; anya ha adabamiela ha nʼisi nʼihi ahụghị ahịhịa ndụ ha ga-ata.”
Jeremiah 14:6 in English
Jeremiah 14:6 · Berean Standard Bible
Wild donkeys stand on barren heights; they pant for air like jackals;* their eyes fail for lack of pasture.”
Context
4Ala na-agbawa
nʼihi enweghị mmiri ozuzo.
Ndị ọrụ ubi na-ekpuchikwa isi ha
nʼihi obi ọjọọ ha. 5Ọ bụladị nne ele, nke nọ nʼọhịa,
na-ahapụ nwa ọhụrụ ya,
nʼihi na ahịhịa ndụ adịghị. 6Ịnyịnya ibu ọhịa na-eguzokwa nʼelu ebe dị elu nke ahịhịa na-adịghị.
Ha na-eku ume na-ekupụ ngwangwa, ngwangwa, dịka nkịta ọhịa;
anya ha adabamiela ha nʼisi
nʼihi ahụghị ahịhịa ndụ ha ga-ata.” 7Ọ bụ ezie na mmehie anyị na-agbagide anyị ama,
Onyenwe anyị, biko rụọ ọrụ gị nʼihi aha gị.
Anyị emehiela megide gị.
Ndaghachi azụ anyị site nʼebe ị nọ dịkwa ukwuu. 8Gị, onye bụ olileanya Izrel.
Onye Nzọpụta ya nʼoge ahụhụ,
gịnị mere i ji nọdụ dịka onye ọbịa nʼala a,
dịka onye ije nke na-anọ naanị ọnọdụ otu abalị?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.