Native Bible

Jeremiah 14:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ịnyịnya ibu ọhịa na-eguzokwa nʼelu ebe dị elu nke ahịhịa na-adịghị. Ha na-eku ume na-ekupụ ngwangwa, ngwangwa, dịka nkịta ọhịa; anya ha adabamiela ha nʼisi nʼihi ahụghị ahịhịa ndụ ha ga-ata.”

Jeremiah 14:6 in English

Jeremiah 14:6 · Berean Standard Bible

Wild donkeys stand on barren heights; they pant for air like jackals;* their eyes fail for lack of pasture.”

Context

4Ala na-agbawa nʼihi enweghị mmiri ozuzo. Ndị ọrụ ubi na-ekpuchikwa isi ha nʼihi obi ọjọọ ha. 5Ọ bụladị nne ele, nke nọ nʼọhịa, na-ahapụ nwa ọhụrụ ya, nʼihi na ahịhịa ndụ adịghị. 6Ịnyịnya ibu ọhịa na-eguzokwa nʼelu ebe dị elu nke ahịhịa na-adịghị. Ha na-eku ume na-ekupụ ngwangwa, ngwangwa, dịka nkịta ọhịa; anya ha adabamiela ha nʼisi nʼihi ahụghị ahịhịa ndụ ha ga-ata.” 7Ọ bụ ezie na mmehie anyị na-agbagide anyị ama, Onyenwe anyị, biko rụọ ọrụ gị nʼihi aha gị. Anyị emehiela megide gị. Ndaghachi azụ anyị site nʼebe ị nọ dịkwa ukwuu. 8Gị, onye bụ olileanya Izrel. Onye Nzọpụta ya nʼoge ahụhụ, gịnị mere i ji nọdụ dịka onye ọbịa nʼala a, dịka onye ije nke na-anọ naanị ọnọdụ otu abalị?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.