Jeremaya 14:7
Jeremiah 14:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ ezie na mmehie anyị na-agbagide anyị ama, Onyenwe anyị, biko rụọ ọrụ gị nʼihi aha gị. Anyị emehiela megide gị. Ndaghachi azụ anyị site nʼebe ị nọ dịkwa ukwuu.
Jeremiah 14:7 in English
Jeremiah 14:7 · Berean Standard Bible
Although our iniquities testify against us, O LORD, act for the sake of Your name. Indeed, our rebellions are many; we have sinned against You.
Context
5Ọ bụladị nne ele, nke nọ nʼọhịa,
na-ahapụ nwa ọhụrụ ya,
nʼihi na ahịhịa ndụ adịghị. 6Ịnyịnya ibu ọhịa na-eguzokwa nʼelu ebe dị elu nke ahịhịa na-adịghị.
Ha na-eku ume na-ekupụ ngwangwa, ngwangwa, dịka nkịta ọhịa;
anya ha adabamiela ha nʼisi
nʼihi ahụghị ahịhịa ndụ ha ga-ata.” 7Ọ bụ ezie na mmehie anyị na-agbagide anyị ama,
Onyenwe anyị, biko rụọ ọrụ gị nʼihi aha gị.
Anyị emehiela megide gị.
Ndaghachi azụ anyị site nʼebe ị nọ dịkwa ukwuu. 8Gị, onye bụ olileanya Izrel.
Onye Nzọpụta ya nʼoge ahụhụ,
gịnị mere i ji nọdụ dịka onye ọbịa nʼala a,
dịka onye ije nke na-anọ naanị ọnọdụ otu abalị? 9Gịnị mere i ji nọdụ dịka onye ihe mere na mberede,
dịka dike nke na-enweghị ike ịzọpụta?
Onyenwe anyị, ị nọ nʼetiti anyị;
ọ bụkwa aha gị ka a kpọkwasịrị anyị.
Ahapụkwala anyị!
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.