Jeremaya 14:5
Jeremiah 14:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụladị nne ele, nke nọ nʼọhịa, na-ahapụ nwa ọhụrụ ya, nʼihi na ahịhịa ndụ adịghị.
Jeremiah 14:5 in English
Jeremiah 14:5 · Berean Standard Bible
Even the doe in the field deserts her newborn fawn because there is no grass.
Context
3Ndị a na-asọpụrụ na-ezipụ ndị ohu ha ịga chọta mmiri.
Ha na-aga nʼolulu mmiri
ma o nweghị mmiri ha na-achọta.
Ha bu ite nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya na-alọta.
Ha ji aka ha kpuchie isi ha
nʼihi ịda mba nke obi na nʼihi ọnọdụ obi ọjọọ nke ha nọ nʼime ya. 4Ala na-agbawa
nʼihi enweghị mmiri ozuzo.
Ndị ọrụ ubi na-ekpuchikwa isi ha
nʼihi obi ọjọọ ha. 5Ọ bụladị nne ele, nke nọ nʼọhịa,
na-ahapụ nwa ọhụrụ ya,
nʼihi na ahịhịa ndụ adịghị. 6Ịnyịnya ibu ọhịa na-eguzokwa nʼelu ebe dị elu nke ahịhịa na-adịghị.
Ha na-eku ume na-ekupụ ngwangwa, ngwangwa, dịka nkịta ọhịa;
anya ha adabamiela ha nʼisi
nʼihi ahụghị ahịhịa ndụ ha ga-ata.” 7Ọ bụ ezie na mmehie anyị na-agbagide anyị ama,
Onyenwe anyị, biko rụọ ọrụ gị nʼihi aha gị.
Anyị emehiela megide gị.
Ndaghachi azụ anyị site nʼebe ị nọ dịkwa ukwuu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.