Jeremaya 14:4
Jeremiah 14:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ala na-agbawa nʼihi enweghị mmiri ozuzo. Ndị ọrụ ubi na-ekpuchikwa isi ha nʼihi obi ọjọọ ha.
Jeremiah 14:4 in English
Jeremiah 14:4 · Berean Standard Bible
The ground is cracked because no rain has fallen on the land. The farmers are ashamed; they cover their heads.
Context
2“Juda na-eru ụjụ,
ndị bi nʼobodo ya niile na-ahụjukwa anya.
Ha na-akwa akwa nʼihi ala ahụ,
ụda ịkwa akwa ha eruokwala Jerusalem. 3Ndị a na-asọpụrụ na-ezipụ ndị ohu ha ịga chọta mmiri.
Ha na-aga nʼolulu mmiri
ma o nweghị mmiri ha na-achọta.
Ha bu ite nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya na-alọta.
Ha ji aka ha kpuchie isi ha
nʼihi ịda mba nke obi na nʼihi ọnọdụ obi ọjọọ nke ha nọ nʼime ya. 4Ala na-agbawa
nʼihi enweghị mmiri ozuzo.
Ndị ọrụ ubi na-ekpuchikwa isi ha
nʼihi obi ọjọọ ha. 5Ọ bụladị nne ele, nke nọ nʼọhịa,
na-ahapụ nwa ọhụrụ ya,
nʼihi na ahịhịa ndụ adịghị. 6Ịnyịnya ibu ọhịa na-eguzokwa nʼelu ebe dị elu nke ahịhịa na-adịghị.
Ha na-eku ume na-ekupụ ngwangwa, ngwangwa, dịka nkịta ọhịa;
anya ha adabamiela ha nʼisi
nʼihi ahụghị ahịhịa ndụ ha ga-ata.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.