Jeremaya 14:9
Jeremiah 14:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị mere i ji nọdụ dịka onye ihe mere na mberede, dịka dike nke na-enweghị ike ịzọpụta? Onyenwe anyị, ị nọ nʼetiti anyị; ọ bụkwa aha gị ka a kpọkwasịrị anyị. Ahapụkwala anyị!
Jeremiah 14:9 in English
Jeremiah 14:9 · Berean Standard Bible
Why are You like a man taken by surprise, like a warrior powerless to save? Yet You are among us, O LORD, and we are called by Your name. Do not forsake us!
Context
7Ọ bụ ezie na mmehie anyị na-agbagide anyị ama,
Onyenwe anyị, biko rụọ ọrụ gị nʼihi aha gị.
Anyị emehiela megide gị.
Ndaghachi azụ anyị site nʼebe ị nọ dịkwa ukwuu. 8Gị, onye bụ olileanya Izrel.
Onye Nzọpụta ya nʼoge ahụhụ,
gịnị mere i ji nọdụ dịka onye ọbịa nʼala a,
dịka onye ije nke na-anọ naanị ọnọdụ otu abalị? 9Gịnị mere i ji nọdụ dịka onye ihe mere na mberede,
dịka dike nke na-enweghị ike ịzọpụta?
Onyenwe anyị, ị nọ nʼetiti anyị;
ọ bụkwa aha gị ka a kpọkwasịrị anyị.
Ahapụkwala anyị! 10Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere ndị a,
“Ha hụrụ mwagharị nʼanya nke ukwuu.
Ụkwụ ha adịghị anọkwa nʼotu ebe.
Nʼihi nke a, ihe banyere ha adịghị atọkwa Onyenwe anyị ụtọ.
Ugbu a kwa ka ọ na-echeta ajọ omume ha,
ọ ga-atakwa ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.” 11Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Ekpela ekpere nʼihi ọdịmma ndị a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.