Jeremaya 14:11
Jeremiah 14:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Ekpela ekpere nʼihi ọdịmma ndị a.
Jeremiah 14:11 in English
Jeremiah 14:11 · Berean Standard Bible
Then the LORD said to me, “Do not pray for the well-being of this people.
Context
9Gịnị mere i ji nọdụ dịka onye ihe mere na mberede,
dịka dike nke na-enweghị ike ịzọpụta?
Onyenwe anyị, ị nọ nʼetiti anyị;
ọ bụkwa aha gị ka a kpọkwasịrị anyị.
Ahapụkwala anyị! 10Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere ndị a,
“Ha hụrụ mwagharị nʼanya nke ukwuu.
Ụkwụ ha adịghị anọkwa nʼotu ebe.
Nʼihi nke a, ihe banyere ha adịghị atọkwa Onyenwe anyị ụtọ.
Ugbu a kwa ka ọ na-echeta ajọ omume ha,
ọ ga-atakwa ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.” 11Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Ekpela ekpere nʼihi ọdịmma ndị a. 12Ọ bụ ezie na ha na-ebu ọnụ, agaghị m ege ntị nʼakwa ha; ọ bụrụkwa na ha achụọrọ m aja nsure ọkụ, maọbụ aja mkpụrụ onyinye, agaghị m anabata ha. Kama, aga m eji mma agha na ụnwụ, na ọrịa dị iche iche bibie ha.” 13Ma asịrị m, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị! Lee na ndị amụma na-asị ha, ‘Unu agaghị ahụ mma agha anya, maọbụ hụ ahụhụ nke ụnwụ na-eweta, nʼeziokwu, aga m enye unu udo nke na-adịgide adịgide nʼebe a.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.