Jeremaya 12:8
Jeremiah 12:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe nketa m aghọrọọla m, ihe dịka ọdụm nọ nʼọhịa, Ọ na-agbọ ụja megide m; ya mere, m ji kpọọ ya asị.
Jeremiah 12:8 in English
Jeremiah 12:8 · Berean Standard Bible
My inheritance has become to Me like a lion in the forest. She has roared against Me; therefore I hate her.
Context
6Lee, ọ bụladị ụmụnne gị, ndị ezinaụlọ nke aka gị,
ararala gị nye.
Lee, ha eweliela oke olu iti mkpu megide gị.
Atụkwasịla ha obi,
ọ bụladị mgbe ha na-ekwu okwu ọma banyere gị. 7“Aga m agbakụta ụlọ m
na ihe nketa m họpụtara nye onwe m azụ.
Aga m ewere onye ahụ m hụrụ nʼanya
nyefee ya nʼaka onye iro ya. 8Ihe nketa m aghọrọọla m,
ihe dịka ọdụm nọ nʼọhịa,
Ọ na-agbọ ụja megide m;
ya mere, m ji kpọọ ya asị. 9Ọ bụ na ihe nketa m aghọbeghị
nnụnụ ugo tụrụ agwa nye m
nke ọtụtụ ugo gbara gburugburu na-emegide ya?
Gaanụ, kpọkọta ụmụ anụ ọhịa niile,
mee ka ha zukọọ bịa dọrie nri. 10Ọtụtụ ndị ọzụzụ atụrụ ebibiela ubi vaịnị m.
Ha azọtọọla ubi m nʼokpuru ụkwụ,
ha emeela ka ubi m mara mma
ghọọ ọzara tọgbọrọ nʼefu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.