Native Bible

Jeremiah 12:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lee, ọ bụladị ụmụnne gị, ndị ezinaụlọ nke aka gị, ararala gị nye. Lee, ha eweliela oke olu iti mkpu megide gị. Atụkwasịla ha obi, ọ bụladị mgbe ha na-ekwu okwu ọma banyere gị.

Jeremiah 12:6 in English

Jeremiah 12:6 · Berean Standard Bible

Even your brothers— your own father’s household— even they have betrayed you; even they have cried aloud against you. Do not trust them, though they speak well of you.

Context

4Ruo ole mgbe ka ala ga-eru ụjụ? Ruo ole mgbe ka ahịhịa dị nʼubi ga-anọgide na-akpọnwụ? Ụmụ anụmanụ na nnụnụ na-anwụchasị nʼihi na ndị bi nʼala ahụ bụ ndị na-emebi iwu. Ma ndị mmadụ ahụ na-ekwu sị, “Ọ gaghị ahụ ihe ga-adakwasị anyị.” 5“Ọ bụrụ na ndị ji ụkwụ ha agba ọsọ emerie gị nʼọsọ nke gị na ha gbara, i si aṅaa chee na gị na ndị ji ịnyịnya agba ọsọ nwere ike ịgbakọta ọsọ ịsọ mpi? Ọ bụrụ na ị sọọ ngọngọ nʼala ebe udo dị, ị ga-esi aṅaa ghara ịsọ ngọngọ nʼọhịa dị nʼakụkụ osimiri Jọdan? 6Lee, ọ bụladị ụmụnne gị, ndị ezinaụlọ nke aka gị, ararala gị nye. Lee, ha eweliela oke olu iti mkpu megide gị. Atụkwasịla ha obi, ọ bụladị mgbe ha na-ekwu okwu ọma banyere gị. 7“Aga m agbakụta ụlọ m na ihe nketa m họpụtara nye onwe m azụ. Aga m ewere onye ahụ m hụrụ nʼanya nyefee ya nʼaka onye iro ya. 8Ihe nketa m aghọrọọla m, ihe dịka ọdụm nọ nʼọhịa, Ọ na-agbọ ụja megide m; ya mere, m ji kpọọ ya asị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.