Native Bible

Jeremiah 12:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Aga m agbakụta ụlọ m na ihe nketa m họpụtara nye onwe m azụ. Aga m ewere onye ahụ m hụrụ nʼanya nyefee ya nʼaka onye iro ya.

Jeremiah 12:7 in English

Jeremiah 12:7 · Berean Standard Bible

I have forsaken My house; I have abandoned My inheritance. I have given the love of My life into the hands of her enemies.

Context

5“Ọ bụrụ na ndị ji ụkwụ ha agba ọsọ emerie gị nʼọsọ nke gị na ha gbara, i si aṅaa chee na gị na ndị ji ịnyịnya agba ọsọ nwere ike ịgbakọta ọsọ ịsọ mpi? Ọ bụrụ na ị sọọ ngọngọ nʼala ebe udo dị, ị ga-esi aṅaa ghara ịsọ ngọngọ nʼọhịa dị nʼakụkụ osimiri Jọdan? 6Lee, ọ bụladị ụmụnne gị, ndị ezinaụlọ nke aka gị, ararala gị nye. Lee, ha eweliela oke olu iti mkpu megide gị. Atụkwasịla ha obi, ọ bụladị mgbe ha na-ekwu okwu ọma banyere gị. 7“Aga m agbakụta ụlọ m na ihe nketa m họpụtara nye onwe m azụ. Aga m ewere onye ahụ m hụrụ nʼanya nyefee ya nʼaka onye iro ya. 8Ihe nketa m aghọrọọla m, ihe dịka ọdụm nọ nʼọhịa, Ọ na-agbọ ụja megide m; ya mere, m ji kpọọ ya asị. 9Ọ bụ na ihe nketa m aghọbeghị nnụnụ ugo tụrụ agwa nye m nke ọtụtụ ugo gbara gburugburu na-emegide ya? Gaanụ, kpọkọta ụmụ anụ ọhịa niile, mee ka ha zukọọ bịa dọrie nri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.