Jeremaya 12:5
Jeremiah 12:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ bụrụ na ndị ji ụkwụ ha agba ọsọ emerie gị nʼọsọ nke gị na ha gbara, i si aṅaa chee na gị na ndị ji ịnyịnya agba ọsọ nwere ike ịgbakọta ọsọ ịsọ mpi? Ọ bụrụ na ị sọọ ngọngọ nʼala ebe udo dị, ị ga-esi aṅaa ghara ịsọ ngọngọ nʼọhịa dị nʼakụkụ osimiri Jọdan?
Jeremiah 12:5 in English
Jeremiah 12:5 · Berean Standard Bible
“If you have raced with men on foot and they have worn you out, how can you compete with horses? If you stumble in a peaceful land, how will you do in the thickets of the Jordan?
Context
3Ma gị onwe gị maara m Onyenwe anyị;
ị na-ahụ m, na-anwapụtakwa echiche niile m na-eche banyere gị.
Dọkpụrụ ha dịka atụrụ a ga-egbu egbu.
Doo ha iche nye ụbọchị ahụ a ga-egbu ha. 4Ruo ole mgbe ka ala ga-eru ụjụ?
Ruo ole mgbe ka ahịhịa dị nʼubi ga-anọgide na-akpọnwụ?
Ụmụ anụmanụ na nnụnụ na-anwụchasị
nʼihi na ndị bi nʼala ahụ bụ ndị na-emebi iwu.
Ma ndị mmadụ ahụ na-ekwu sị,
“Ọ gaghị ahụ ihe ga-adakwasị anyị.” 5“Ọ bụrụ na ndị ji ụkwụ ha agba ọsọ
emerie gị nʼọsọ nke gị na ha gbara,
i si aṅaa chee na gị na ndị ji ịnyịnya agba ọsọ nwere ike ịgbakọta ọsọ ịsọ mpi?
Ọ bụrụ na ị sọọ ngọngọ nʼala ebe udo dị,
ị ga-esi aṅaa ghara ịsọ ngọngọ nʼọhịa dị nʼakụkụ osimiri Jọdan? 6Lee, ọ bụladị ụmụnne gị, ndị ezinaụlọ nke aka gị,
ararala gị nye.
Lee, ha eweliela oke olu iti mkpu megide gị.
Atụkwasịla ha obi,
ọ bụladị mgbe ha na-ekwu okwu ọma banyere gị. 7“Aga m agbakụta ụlọ m
na ihe nketa m họpụtara nye onwe m azụ.
Aga m ewere onye ahụ m hụrụ nʼanya
nyefee ya nʼaka onye iro ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.