Jeremaya 12:3
Jeremiah 12:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma gị onwe gị maara m Onyenwe anyị; ị na-ahụ m, na-anwapụtakwa echiche niile m na-eche banyere gị. Dọkpụrụ ha dịka atụrụ a ga-egbu egbu. Doo ha iche nye ụbọchị ahụ a ga-egbu ha.
Jeremiah 12:3 in English
Jeremiah 12:3 · Berean Standard Bible
But You know me, O LORD; You see me and test my heart toward You. Drag away the wicked like sheep to the slaughter and set them apart for the day of carnage.
Context
1Onye ezi omume ka ị bụ mgbe niile, gị Onyenwe anyị,
mgbe ọbụla m butere ikpe bịa nʼihu gị.
Ma achọrọ m ịgwa gị okwu banyere ikpe ziri ezi gị:
Gịnị mere ihe ji agara ndị ajọ omume nke ọma?
Gịnị mere ndị na-aghọ aghụghọ ji ebi ndụ enweghị nsogbu ọbụla? 2Ị kụọla ha ka osisi, ha agbaala mgbọrọgwụ;
ha na-etokwa na-amị mkpụrụ.
Ị nọ nso mgbe niile nʼọnụ ha,
ma ị nọ nʼebe dị anya nʼobi ha. 3Ma gị onwe gị maara m Onyenwe anyị;
ị na-ahụ m, na-anwapụtakwa echiche niile m na-eche banyere gị.
Dọkpụrụ ha dịka atụrụ a ga-egbu egbu.
Doo ha iche nye ụbọchị ahụ a ga-egbu ha. 4Ruo ole mgbe ka ala ga-eru ụjụ?
Ruo ole mgbe ka ahịhịa dị nʼubi ga-anọgide na-akpọnwụ?
Ụmụ anụmanụ na nnụnụ na-anwụchasị
nʼihi na ndị bi nʼala ahụ bụ ndị na-emebi iwu.
Ma ndị mmadụ ahụ na-ekwu sị,
“Ọ gaghị ahụ ihe ga-adakwasị anyị.” 5“Ọ bụrụ na ndị ji ụkwụ ha agba ọsọ
emerie gị nʼọsọ nke gị na ha gbara,
i si aṅaa chee na gị na ndị ji ịnyịnya agba ọsọ nwere ike ịgbakọta ọsọ ịsọ mpi?
Ọ bụrụ na ị sọọ ngọngọ nʼala ebe udo dị,
ị ga-esi aṅaa ghara ịsọ ngọngọ nʼọhịa dị nʼakụkụ osimiri Jọdan?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.