Jeremaya 12:10
Jeremiah 12:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọtụtụ ndị ọzụzụ atụrụ ebibiela ubi vaịnị m. Ha azọtọọla ubi m nʼokpuru ụkwụ, ha emeela ka ubi m mara mma ghọọ ọzara tọgbọrọ nʼefu.
Jeremiah 12:10 in English
Jeremiah 12:10 · Berean Standard Bible
Many shepherds have destroyed My vineyard; they have trampled My plot of ground. They have turned My pleasant field into a desolate wasteland.
Context
8Ihe nketa m aghọrọọla m,
ihe dịka ọdụm nọ nʼọhịa,
Ọ na-agbọ ụja megide m;
ya mere, m ji kpọọ ya asị. 9Ọ bụ na ihe nketa m aghọbeghị
nnụnụ ugo tụrụ agwa nye m
nke ọtụtụ ugo gbara gburugburu na-emegide ya?
Gaanụ, kpọkọta ụmụ anụ ọhịa niile,
mee ka ha zukọọ bịa dọrie nri. 10Ọtụtụ ndị ọzụzụ atụrụ ebibiela ubi vaịnị m.
Ha azọtọọla ubi m nʼokpuru ụkwụ,
ha emeela ka ubi m mara mma
ghọọ ọzara tọgbọrọ nʼefu. 11Ha emeela ya ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu;
e, ọ ghọọla ebe kpọrọ nkụ nʼebe tọgbọrọ nʼefu nʼihu m.
Ala ahụ niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu,
nʼihi na o nweghị onye ọbụla ihe banyere ya na-emetụ nʼobi. 12Ndị mbibi ga-ejupụta
nʼelu ebe niile dị elu nke ọzara,
nʼihi na mma agha Onyenwe anyị
ga-esite nʼotu nsọtụ ala ahụ ruo na nsọtụ nke ọzọ, ripịa ndị niile dị na ya.
O nweghị onye ọbụla udo ga-adịrị nʼala ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.