Jeremaya 12:11
Jeremiah 12:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha emeela ya ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu; e, ọ ghọọla ebe kpọrọ nkụ nʼebe tọgbọrọ nʼefu nʼihu m. Ala ahụ niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu, nʼihi na o nweghị onye ọbụla ihe banyere ya na-emetụ nʼobi.
Jeremiah 12:11 in English
Jeremiah 12:11 · Berean Standard Bible
They have made it a desolation; desolate before Me, it mourns. All the land is laid waste, but no man takes it to heart.
Context
9Ọ bụ na ihe nketa m aghọbeghị
nnụnụ ugo tụrụ agwa nye m
nke ọtụtụ ugo gbara gburugburu na-emegide ya?
Gaanụ, kpọkọta ụmụ anụ ọhịa niile,
mee ka ha zukọọ bịa dọrie nri. 10Ọtụtụ ndị ọzụzụ atụrụ ebibiela ubi vaịnị m.
Ha azọtọọla ubi m nʼokpuru ụkwụ,
ha emeela ka ubi m mara mma
ghọọ ọzara tọgbọrọ nʼefu. 11Ha emeela ya ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu;
e, ọ ghọọla ebe kpọrọ nkụ nʼebe tọgbọrọ nʼefu nʼihu m.
Ala ahụ niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu,
nʼihi na o nweghị onye ọbụla ihe banyere ya na-emetụ nʼobi. 12Ndị mbibi ga-ejupụta
nʼelu ebe niile dị elu nke ọzara,
nʼihi na mma agha Onyenwe anyị
ga-esite nʼotu nsọtụ ala ahụ ruo na nsọtụ nke ọzọ, ripịa ndị niile dị na ya.
O nweghị onye ọbụla udo ga-adịrị nʼala ahụ. 13Ha ga-agha mkpụrụ ọka wiiti, maọbụ ogwu ga-epuru ha.
Ha ga-adọgbu onwe ha nʼọrụ ma ha agaghị enweta ihe ọbụla.
Ya mere, ka ihe ihere unu ghọtara dịka ihe ubi dịrị unu,
nʼihi na ahụhụ ndị a sitere nʼiwe dị ọkụ nke Onyenwe anyị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.