Jeremaya 12:13
Jeremiah 12:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-agha mkpụrụ ọka wiiti, maọbụ ogwu ga-epuru ha. Ha ga-adọgbu onwe ha nʼọrụ ma ha agaghị enweta ihe ọbụla. Ya mere, ka ihe ihere unu ghọtara dịka ihe ubi dịrị unu, nʼihi na ahụhụ ndị a sitere nʼiwe dị ọkụ nke Onyenwe anyị.”
Jeremiah 12:13 in English
Jeremiah 12:13 · Berean Standard Bible
They have sown wheat but harvested thorns. They have exhausted themselves to no avail. Bear the shame of your harvest because of the fierce anger of the LORD.”
Context
11Ha emeela ya ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu;
e, ọ ghọọla ebe kpọrọ nkụ nʼebe tọgbọrọ nʼefu nʼihu m.
Ala ahụ niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu,
nʼihi na o nweghị onye ọbụla ihe banyere ya na-emetụ nʼobi. 12Ndị mbibi ga-ejupụta
nʼelu ebe niile dị elu nke ọzara,
nʼihi na mma agha Onyenwe anyị
ga-esite nʼotu nsọtụ ala ahụ ruo na nsọtụ nke ọzọ, ripịa ndị niile dị na ya.
O nweghị onye ọbụla udo ga-adịrị nʼala ahụ. 13Ha ga-agha mkpụrụ ọka wiiti, maọbụ ogwu ga-epuru ha.
Ha ga-adọgbu onwe ha nʼọrụ ma ha agaghị enweta ihe ọbụla.
Ya mere, ka ihe ihere unu ghọtara dịka ihe ubi dịrị unu,
nʼihi na ahụhụ ndị a sitere nʼiwe dị ọkụ nke Onyenwe anyị.” 14Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ma banyere ndị agbataobi ọjọọ m ahụ niile, bụ ndị na-apụnara ndị m Izrel ihe nketa ahụ m nyere ha. Aga m esite nʼala ha hopu ha. Aga m esitekwa nʼetiti ha hopu ụlọ Juda. 15Ma mgbe m hopuchara ha, aga m emesịa meere ha ebere, meekwa ka onye ọbụla nʼime ha laghachikwa nʼobodo nke aka ya. Ha ga-enwetakwa ihe nketa ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.