Jeremaya 12:15
Jeremiah 12:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma mgbe m hopuchara ha, aga m emesịa meere ha ebere, meekwa ka onye ọbụla nʼime ha laghachikwa nʼobodo nke aka ya. Ha ga-enwetakwa ihe nketa ha niile.
Jeremiah 12:15 in English
Jeremiah 12:15 · Berean Standard Bible
But after I have uprooted them, I will once again have compassion on them and return each one to his inheritance and to his land.
Context
13Ha ga-agha mkpụrụ ọka wiiti, maọbụ ogwu ga-epuru ha.
Ha ga-adọgbu onwe ha nʼọrụ ma ha agaghị enweta ihe ọbụla.
Ya mere, ka ihe ihere unu ghọtara dịka ihe ubi dịrị unu,
nʼihi na ahụhụ ndị a sitere nʼiwe dị ọkụ nke Onyenwe anyị.” 14Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ma banyere ndị agbataobi ọjọọ m ahụ niile, bụ ndị na-apụnara ndị m Izrel ihe nketa ahụ m nyere ha. Aga m esite nʼala ha hopu ha. Aga m esitekwa nʼetiti ha hopu ụlọ Juda. 15Ma mgbe m hopuchara ha, aga m emesịa meere ha ebere, meekwa ka onye ọbụla nʼime ha laghachikwa nʼobodo nke aka ya. Ha ga-enwetakwa ihe nketa ha niile. 16Ọ bụrụkwa na ha amụta ụzọ niile nke ndị m nke ọma, na iji aha m ṅụọ iyi, na-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’ dịka ha si kuziere ndị m iji aha Baal na-aṅụ iyi, aga m eme ka ha guzosie ike nʼetiti ndị m. 17Ma ọ bụrụ na mba ọbụla ajụ ige ntị, aga m ehopu ha kpamkpam, laa ha nʼiyi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.