Aịzaya 65:11
Isaiah 65:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma unu ndị wezugara onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ, ndị chezọrọ ugwu nsọ m, ndị na-edozi tebul maka Ihuọma, ndị na-agbaju mmanya agwara ọgwa nʼiko maka Akara aka.*
Isaiah 65:11 in English
Isaiah 65:11 · Berean Standard Bible
But you who forsake the LORD, who forget My holy mountain, who set a table for Fortune * and fill bowls of mixed wine for Destiny,*
Context
9Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta,
sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile.
Ndị m họpụtara ga-eketa ha,
ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ. 10Sharọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke igwe anụ ụlọ;
Ndagwurugwu Akọ ga-abụkwa ebe izuike nye igwe ehi,
na ndị m na-achọsi m ike. 11“Ma unu ndị wezugara onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ,
ndị chezọrọ ugwu nsọ m,
ndị na-edozi tebul maka Ihuọma,
ndị na-agbaju mmanya agwara ọgwa nʼiko maka Akara aka.* 12Aga m eme ka unu zute mma agha;
unu niile ga-adakwa mgbe a na-egbu unu.
Nʼihi na akpọrọ m unu ma unu azaghị;
mgbe m gwara unu okwu, unu aṅaghị ntị.
Unu kpachapụrụ anya mehie megide m nʼihu,
họrọkwa ime ihe ndị ahụ unu maara nke ọma na m kpọrọ asị.” 13Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,
“Ndị ohu m ga-eriju afọ,
ma unu ga-anọ agụụ,
akpịrị ga-akpọkwa unu nkụ,
ma ha ga-aṅụ mmiri.
Unu ga-anọ nʼọnụma na ihere,
ma ha ga-anọ nʼọṅụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.