Native Bible

Isaiah 65:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Sharọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke igwe anụ ụlọ; Ndagwurugwu Akọ ga-abụkwa ebe izuike nye igwe ehi, na ndị m na-achọsi m ike.

Isaiah 65:10 in English

Isaiah 65:10 · Berean Standard Bible

Sharon will become a pasture for flocks, and the Valley of Achor a resting place for herds, for My people who seek Me.

Context

8Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnị ndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya, nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’ otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m; Agaghị m ebibicha ha niile. 9Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta, sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile. Ndị m họpụtara ga-eketa ha, ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ. 10Sharọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke igwe anụ ụlọ; Ndagwurugwu Akọ ga-abụkwa ebe izuike nye igwe ehi, na ndị m na-achọsi m ike. 11“Ma unu ndị wezugara onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ, ndị chezọrọ ugwu nsọ m, ndị na-edozi tebul maka Ihuọma, ndị na-agbaju mmanya agwara ọgwa nʼiko maka Akara aka.* 12Aga m eme ka unu zute mma agha; unu niile ga-adakwa mgbe a na-egbu unu. Nʼihi na akpọrọ m unu ma unu azaghị; mgbe m gwara unu okwu, unu aṅaghị ntị. Unu kpachapụrụ anya mehie megide m nʼihu, họrọkwa ime ihe ndị ahụ unu maara nke ọma na m kpọrọ asị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.