Aịzaya 65:8
Isaiah 65:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnị ndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya, nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’ otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m; Agaghị m ebibicha ha niile.
Isaiah 65:8 in English
Isaiah 65:8 · Berean Standard Bible
This is what the LORD says: “As the new wine is found in a cluster of grapes, and men say, ‘Do not destroy it, for it contains a blessing,’ so I will act on behalf of My servants; I will not destroy them all.
Context
6“Lee, edeela ya rịị nʼihu m sị:
Agaghị m agba nkịtị, aga m akwụghachi nʼuju.
E, aga m akwụghachi ha. 7Ọ bụghị naanị maka mmehie ha, kama maka mmehie nna nna ha niile,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Nʼihi na ha surere aja nsure ọkụ nʼelu ugwu dị iche iche,
kparịakwa m nʼelu ugwu nta niile.
Aga m akwụghachi ha nʼuju,
nʼihi ihe ndị a niile ha mere nʼoge gara aga.” 8Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnị
ndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya,
nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’
otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m;
Agaghị m ebibicha ha niile. 9Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta,
sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile.
Ndị m họpụtara ga-eketa ha,
ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ. 10Sharọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke igwe anụ ụlọ;
Ndagwurugwu Akọ ga-abụkwa ebe izuike nye igwe ehi,
na ndị m na-achọsi m ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.