Aịzaya 65:7
Isaiah 65:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụghị naanị maka mmehie ha, kama maka mmehie nna nna ha niile,” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Nʼihi na ha surere aja nsure ọkụ nʼelu ugwu dị iche iche, kparịakwa m nʼelu ugwu nta niile. Aga m akwụghachi ha nʼuju, nʼihi ihe ndị a niile ha mere nʼoge gara aga.”
Isaiah 65:7 in English
Isaiah 65:7 · Berean Standard Bible
both for your iniquities and for those of your fathers,” says the LORD. “Because they burned incense on the mountains and scorned Me on the hills, I will measure into their laps full payment for their former deeds.”
Context
5ndị na-asịrịta onwe ha, ‘Nọdụ iche, Abịala m nso,
nʼihi na ị ga-emerụ m, adị m nsọ karịa gị!’
Ma ndị dị otu a dịka anwụrụ ọkụ nʼimi m.
Ha bụ ọkụ na-enwu ehihie na nʼabalị. 6“Lee, edeela ya rịị nʼihu m sị:
Agaghị m agba nkịtị, aga m akwụghachi nʼuju.
E, aga m akwụghachi ha. 7Ọ bụghị naanị maka mmehie ha, kama maka mmehie nna nna ha niile,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Nʼihi na ha surere aja nsure ọkụ nʼelu ugwu dị iche iche,
kparịakwa m nʼelu ugwu nta niile.
Aga m akwụghachi ha nʼuju,
nʼihi ihe ndị a niile ha mere nʼoge gara aga.” 8Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnị
ndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya,
nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’
otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m;
Agaghị m ebibicha ha niile. 9Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta,
sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile.
Ndị m họpụtara ga-eketa ha,
ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.