Native Bible

Isaiah 65:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta, sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile. Ndị m họpụtara ga-eketa ha, ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ.

Isaiah 65:9 in English

Isaiah 65:9 · Berean Standard Bible

And I will bring forth descendants from Jacob, and heirs from Judah; My elect will possess My mountains,* and My servants will dwell there.

Context

7Ọ bụghị naanị maka mmehie ha, kama maka mmehie nna nna ha niile,” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Nʼihi na ha surere aja nsure ọkụ nʼelu ugwu dị iche iche, kparịakwa m nʼelu ugwu nta niile. Aga m akwụghachi ha nʼuju, nʼihi ihe ndị a niile ha mere nʼoge gara aga.” 8Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnị ndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya, nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’ otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m; Agaghị m ebibicha ha niile. 9Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta, sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile. Ndị m họpụtara ga-eketa ha, ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ. 10Sharọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke igwe anụ ụlọ; Ndagwurugwu Akọ ga-abụkwa ebe izuike nye igwe ehi, na ndị m na-achọsi m ike. 11“Ma unu ndị wezugara onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ, ndị chezọrọ ugwu nsọ m, ndị na-edozi tebul maka Ihuọma, ndị na-agbaju mmanya agwara ọgwa nʼiko maka Akara aka.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.