Aịzaya 65:6
Isaiah 65:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Lee, edeela ya rịị nʼihu m sị: Agaghị m agba nkịtị, aga m akwụghachi nʼuju. E, aga m akwụghachi ha.
Isaiah 65:6 in English
Isaiah 65:6 · Berean Standard Bible
Behold, it is written before Me: I will not keep silent, but I will repay; I will pay it back into their laps,
Context
4ndị na-anọdụ nʼetiti ili,
ma na-anọdụkwa ọnọdụ abalị nʼebe nzuzo dị iche iche;
ndị na-eri anụ ezi,
ndị ite ofe ha jupụtara nʼanụ na-adịghị ọcha; 5ndị na-asịrịta onwe ha, ‘Nọdụ iche, Abịala m nso,
nʼihi na ị ga-emerụ m, adị m nsọ karịa gị!’
Ma ndị dị otu a dịka anwụrụ ọkụ nʼimi m.
Ha bụ ọkụ na-enwu ehihie na nʼabalị. 6“Lee, edeela ya rịị nʼihu m sị:
Agaghị m agba nkịtị, aga m akwụghachi nʼuju.
E, aga m akwụghachi ha. 7Ọ bụghị naanị maka mmehie ha, kama maka mmehie nna nna ha niile,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Nʼihi na ha surere aja nsure ọkụ nʼelu ugwu dị iche iche,
kparịakwa m nʼelu ugwu nta niile.
Aga m akwụghachi ha nʼuju,
nʼihi ihe ndị a niile ha mere nʼoge gara aga.” 8Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnị
ndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya,
nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’
otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m;
Agaghị m ebibicha ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.